Paxful, Inc. Ọkwa Nzuzo

Paxful, Inc. (akpọkwaazịrị “Paxful,” “Anyị,” “anyị,” maọbụ “Nke anyị”) na-agba mbọ ichekwa nzuzo unu. N'ọkwa nzuzo a (“Ọkwa”),Anyị na-akọwa ụdị ozi keonwe anyị nwere ike inata n'aka gị dịka osi gbasa iji webusaịte nke gụnyere, na-ewepụghị, https://paxful.com/, Àkpà Paxful, Ngalaba azụmahịa ntaneeti bitcoin anyị, ngwa mkpanaka, ụzo mgbasa ozigasị,maọbụ ụzọ ndị ọzọ enwere na ntaneeti, (Na mkpokọta, “Webụsaịt”), maọbụ mgbe i jiri ngwaahịa,ọdịnaya, ọrụ, atụmatụ, teknụụzụ, maọbụ ọrụ ọbụla anyị na-eye (Na mkpokọta, (“Ọrụgasị”).

A haziri ọkwa a iji nyere gị aka nweta ozi gbasara ọrụ nzuzo anyị dịgasị icheiche na inyere gị aka ghọta ọrụ nzuzo ndị ị họọrọ mgbe iji webụsaịt na ọrụ anyị arụ ọrụ. Biko rịbaama na ọrụ anyị na-enye nwere ike ịgbanwe site na mpaghara onye nọ.

N'ogo nile, ọkwa nzuzo asụsụ bekee a ga-abụ nke akụghị mmiri, ngwa nchịkwa.Enwee ka esi nwee ogbatauhie n'ọkwa nzuzo asụsụ bekee a na asụsụ ọzọ atụgharịrị ya, Asụsụ bekee ga-ewere isi ma chịkwaa.

Ozi keonwe anyị na-anakọta

Anyị na-anakọta ozi ndị metụtara gi ("Datà keonwe") nke gbasara etu isi eji webụsaịt ,ọrụ anyị. maọbụ ka osi gbasata gị arụ ọrụ. Ụdị Datà keonwe anyị nwere ike ịnata gị gụnyere:

Datà nkọwaonwe, gụnyere:

  • Aha
  • Addressi Imeelu
  • Akara ekwenti
  • Mbà
  • Addressi Zuru ezu
  • Deeti amụrụ gị

Akaụntụ Paxful n'uju, gụnyere:

  • Ahaonyeọrụ
  • Ozi Profaịlụ dị na ngalaba nkọwaonwe
  • Foto Profaịlụ
  • Deeti Ịsonyere
  • Ego Ndabere
  • Oge mpaghara
  • Asụsụ Ndabere

Ọrụ akaụntụ Paxful, gụnyere:

  • Chaatị Mkparịtaụka azụmaahịa (nke nwere ike inwe ozi gbasara ego ma inye ya ndị òreè)
  • Mkparịtaụka azụmahịa
  • Ọrụ azụmaahịa
  • Ka azụmahịa siri gaa
  • Aha Mgbakwụnye
  • ID Mgbakwụnye
  • Njikọ Mgbakwụnye
  • Mgbakwụnye Azụmahịa
  • Ebumnobi orire na ọzụzụ ahịa emepere
  • Iwu orire na ọzụzụ ahịa
  • Ntụziaka azụmahịaga
  • Nkwupụta akaụntụ
  • Ọnọdụ Akaụntụ

Datà na-egosi ihe I nwere n'àkpàego ntaneeti gị, gụnyere:

  • Ọtụgwọ keonwe
  • Ọtụgwọ Ọha
  • Ụfọ àkpàego
  • Anatara Azụmahịaga
  • Ejipụrụ Azụmahịaga

Datà anakọtara gbasara Nkwenye "Mmata Onyeahịa Gị" (KYC), gụnyere:

  • ID Gọọmenti nyere.
  • Ngosi nke Adressi
  • Foto ma ọbụrụ na enyere gị ikike inye anyị ya.
  • Vedio, ma ọbụrụ na enyere gị ikike inye anyi ya

Datà emefuru na Webụsaịt na Ngwaọrụ, gụnyere:

  • Adressi IP
  • ID Kuki na/maọbụ nchọpụta ngwaọrụ ndị ọzọ
  • Ozi ndị gbasara ohere gị na Webụsaịt, dịka njirimara ngwaọrụ,deeti & oge
  • Asụsụ ịchọrọ
  • Ozi banyere ihe emere ka eji Webụsaịt arụ ọrụ

Data ojiji ngwa mkpanaka, gụnyere:

  • Data nnọkọ: adreesị IP, ụdị nke sistemụ arụmọrụ, akara na ụdị ngwaọrụ, ihe nchọpụta pụrụ iche nke ngwaọrụ ahụ, ihe nchọgharị eji, ozi gbasara oge enwetara Ngwa ahụ, aha na ngwaoru njikọ netwọkụ.
  • Ozi gbasara ngwa arụnyere na ngwaọrụ Onye ọrụ (metadata sitere na ngwa): aha ngwa, njirimara ngwa na ụdị, njirimara ngwaọrụ na checksum. Ịchọta ngwa ọjọọ na ichebe ndị ọrụ site na wayo bụ isi ihe kpatara ịnakọta ozi gbasara ngwa arụnyere.
  • Ozi banyere ihe emere ka eji ngwa ọrụ
  • Data nchọpụta nsogbu mmenyu na ngwa

Ka anyị si eji datà gị arụ ọrụ

Ebumnuche azụmaahịa nke anyị ji maka ya anakọta,jiri,jigide ma ekesa Datà keonwe gị nwere ike ịgụnye:

  • Iji nye ọrụ site n'ime Webụsaịt,gụnyere:
    • Debanye aha gị, mepụta, ma chekwaa akaụntụ gị;
    • Nyochaa njirimara gị na/maọbu ohere gị na akaụntụ, maọbụ nyere ndị òreè nyochaa njirimara gị;
    • Bido, kwado, usoro,na/maọbụ mejupụta azụmahịaga;
    • Gwa gị gbasara akaụntụ gị maọbụ ọrụ ọbụla iji ya arụ;
    • Mee ntozunjiakwụụgwọ, KYC, maọbụ ndị ọzọ yiri ya;
    • Nyochaa ngwaọrụ; maọbu
    • Tụlee ozi maka izi ezi ma nyochaa ebumnuche.
  • Iji jikwaa ihe egwu ma chekwaba gị, ndị ọzọ ya na Webụsaịt na Ọrụ.
  • Iji nye ahụmahụ keonwe ma tinye ọchụchọ gị.
  • Iji ghọta ndịahịa nke ọma na etu ha si eji ma na-emekọrịta na Webụsaịt na ọrụ.
  • Ịgwa gị maka ahịa.
  • Inye Ọrụ nkeonwe, ebumnobi orire na ọzụzụ ahịa na nkwalite na Webụsaịt anyị na Webụsaịt ndị ọzọ ga.
  • Iji nye gị nhọrọ-ebe akọwapụtara nke ọma, arụmọrụ, na ebumnobi orire na ọzụzụ ahịa.
  • Iji rubisi n'iwu na ọrụ anyị, gụnyere mana onweghị ogo njedebe, nkwupụta na nzaghachi atụmatụ ọbụla sitere n'aka ndị mmanyeiwu na/maọbụ ndị na-achịkwa iwu dịka iwu ọbụla siri dị, iwu, ụkpụrụ, usoro ikpe maọbụ nke gọọmentị, usoro iwu nke ikike ruru eru, atụmatụ nchọta maọbụ usoro iwu yiri ya.
  • Iji dozie nghọtahie, nakọta ụgwọ, maọbụ chọpụta nsogbuga.
  • Iji nye gị ọrụ onye ahia maọbụ ọbụ ịgwa gị okwu.
  • Ijikwa azụmahịa anyị.

Anyị nwekwara ike ịhazi Datà Keonwe maka ebumnuche ndị ọzọ dabara na nkwenye gị iwu dị mkpa chọrọ ya.

Ebe anyị si anakọta datà keonwe

Anyị na-anakọta Datà Keonwe site ebe dị icheiche, tinyere

  • Site na aka gị kpọmkwem: Anyị na-anakọta Datà Keonwe n'aka gị mgbe ị na-eji Webụsaịt maọbu ọrụ anyị, na-agwa anyi okwu, maọbu anyị na gị ana-emekorịta kpọmkwem.
  • Site na ndị na-enye ọrụ na/maọbụ ndị nhazi datà na-enyere anyị aka inye Webụsaịt maọbụ Ọrụ: Anyị nwere ike itinye ndị na-eweta ọrụ iji nyere anyị aka ịkwado Webụsaịt maọbụ ọrụ ndị ahụ nye gị, na ntụziaka anyị na aha anyị. Ndị ọrụ a nwere ike ịnakọta ozi gbasara gị ma nye anyị ya.
  • Site na ndị ọrụ ndị ọzọ na Webụsaịt Paxful maọbụ ndị mgbakwụnye ejikọrọ na Webụsaịt maọbụ Ọrụ Paxful: Ndị ọrụ ndị ọzọ nwere ike inye anyị ozi gbasara gị ka osi metụta azụmahịa maọbu mkpakọrịtaga. Mgbakwụnyega nwere ike inye anyị ozi gbasara ka osi metụta mkparịtaụka maọbu azụmahịa gị na ndị mgbakwụnyega dị etu ahụ.
  • E nwekwara ike inyere anyị aka site na ndị ọzọ ịchọpụta njirimara,gbochie aghụghọ, ma chekwaa azụmahịaga.
  • Site na ndị ọzọga nwere ike inyere anyị nyocha ntozunjiakwụụgwọ maọbụ ọnọdụ ego gị.
  • Site na ndị ozọ nwere ike inyere anyị aka nyochaa Datà Keonwe, kwalite Webụsaịt maọbụ ọrụ maọbụ nsirihụ gị na ya, ngwaahịa maọbụ ọrụ ahịa, maọbụ nye gị nkwalite na ebumnobi ọzụzụ na orire ahịa.
  • Site na ngalaba mgbasaozi, ọbụrụ na anyị na gị akparịta site na ngalaba mgbasaozi.

Etu anyị si eke datà

N'ọnọdụ ụfọdụ, anyị nwere ike igosipụta Datà Keonwe na nke ndị ọzọ. Ụdị ndị anyị na ha nwere ike íkè Datà Keonwe gụnyere:

  • Ndị na-enye ọrụ maọbụ ndị nhazi datà: Anyị na ndị ọzọ na-eweta ọrụ nwere ike ikekọrịta Datà Keonwe na ọrụ ndị ọzọ na-arụ na ntụziaka anyị.Ndị ọzọ na-enye ọrụ ndị a nwere ike, dịka n'ịmaatụ nye gị Ọrụ, nyochaa njirimara gị, nye aka na nhazi azụmahịa, zitere gị ọkwa maka ngwaahịa na ọrụ anyị, maọbụ nye nkwado onye ahịa.
  • Ndị ọzọ na azụmahịa, dịka ndị òreè: Anyị na ndị ọzọ nwere ike ikekọrịta ozi gbasara azụmahịa gị, tinyere ndị ọru ndị ọzọ ị na-azụta akụ dijitalụ n'aka ha.
  • Ụlọọrụ ego na ụlọọrụ ndị ọzọ o metụtara inyere gị aka ịkwụ ụgwọ na ka osi gbasa azụmahia
  • Mgbakwụnye ndị nwetara ntzuaka site Webụsaịt anyị
  • Ndị ọzọ anyị na ha na-emekọ maka azụmahịa maọbụ ka iwu kwadoro maọbụ ka ọ chọrọ, tinyere:
    • Iji rube isi n'iwu ọbụla, usoro iwu na nkwekọrịta ya, maọbụ iwu maọbụ usoro iwu ọbụla (dịka ụlọikpe ziri ezi maọbụ akwụkwọ ịkpọoku);
    • Iji gosipụta, gosipụta ike, maọbụ chebe ihe iwu kwuru;
    • N'ịzaghachi ajụjụ sitere n'aka ngalaba na-arụrụ gọọmenti ọrụ, dịka ndị mmanye iwu maọbụ akwụkwọ ịkpọoku;
    • Iji mee ka usoro ọrụ Webụsaịt maọbụ atụmatụ time anyị;
    • Iji gbochie mmebi maọbụ imefu ego, site na nchọcha a na-enyoenyo emere maọbụ agwa iwu na-akwadoghi, maọbụ iji chekwaa ndị ọzọ,nchekwa na ònwùnwé ha;
    • Iji kwado ịzụ na ire ụfọdụ maọbu azụmahịa Paxful nile. Iji maatụ, Site na ikekorita data anyị na otu ụloọrụ chorọ ijikọ maọbụ ịzụrụ site na; maọbu
    • Iji kwado nyocha anyi, nnabata, na ụlọọrụ nke ọrụ gọọmenti.

Inyega datà ga mbaụwa

Biko mara ama na anyị nwere ike inyefe Datà Keonwe anyi natara maka gị nyefee na obodo abụghi nke esi na ya nata ozi ahụ na mbụ. Obodo ndị ahụ nwere ike ha enweghi iwu na-echekwa datà dịka obodo ebe inyere ozi a na mbụ.Mgbe anyị nyefere Datà Keonwe gị n'obodo ndị ọzọ, anyị na-agba mbọ ihụ na emere ya n'ụzo iwu nabatara.

Kuki na mgbasaozi ntanetị

  • Kuki bụ obere ederede webụsaịt na-echekwa na kọmputa maọbu n'ekwentị gị mgbe ị gara na webusaịt.
  • Webụsaịt anyị ji kuki na nsuso teknụzụ arụ ọrụ, ya na iji ịchọpụta mgbasaozi ga-amasị gị. Maka ịmatakwu ozi, biko gaa n'iwu Kuki anyị.
  • Paxful na ndị ọzọ nwere ike ịrụkọ ọrụ n'ịgbasaozi na Webụsaịt Paxful maọbụ na webụsaịta ndị ọzọ. Ọbụghị ndị Paxful na-ekwu ihe na-eme na mgbasaozi webụsaịt ndị ọzọ na etu ndị ọrụ ndị ọzọ ga-esi agbasa ozi. Ụlọmgbasaozi ndị a na-eji teknụzụ datà enweta ozi maka ihe na-eme na ntanetị iji nye gị mgbasaozi ndị ị ga-enwe mmasị na ha. Ọbụrụ na ịchọghị iji ozi a ha na-ezite mere ihe, I nwere ike ịpụ site na iga:

Biko mara na nke a anaghị ewepụ gị n'ịnata mgbasaozi; ị ga na-anata mgbasaozi emere maka ọha nke abughị nke i nwere mmasị na ya kpọmkwem. I nwere ike ijikwa ka ị ga-esi eji kuki arụ ọrụ n'aka nke onwe gị. Ọbụrụ na ịchọghị kuki, i nwere ike ịrụ ọrụ na webụsaịt anyị mana iji njirimara ụfọdụ maọbụ ebe ụfọdụ na Webusaịt anyi agaghị adị n'uju.

Nchekwa datà

Anyi na-echekwa Datà Keonwe n'ihi ihe eji maka ha were nakọta ya, maọbụ oge iwu nyere maka ichekwa ya. Nke a nwere ike ịgunye ichekwa Datà Keonwe n'oge na-esote azụmahịa. Anyị na-agba mbọ ịkachapụ Datà Keonwe gị mgbe anyị enweghịzị azụmahịa anyị ji ya eme dịka akọwara n'elu.

Nchedo datà

Paxful akwadola amụma iji chekwaa Datà Keonwe gị, tinyere usoro ha wepụtara ka Datà Keonwe ghara ifu, etinyeghi n'ọrụ, na ikpughe nke akwadoghi. N'agbanyeghị nke ahụ, Paxful enweghi ike hụ maọbụ nye ikike nchekwa maọbụ ozi ị na-anata maọbụ nke ị na-ezitere anyị site na ntaneti maọbụ na njikọ ikuku. Izipụ datà site na ntaneti nwere ọghọm so ya, ọbụrụgodu na Paxful gbara mbọ ichekwa datà ozigbo ọ natara ya.

Ụmụaka erubeghi afọ 18

Webụsaịt paxfụl abụghị maka ụmụaka erubeghi afọ 18. Anyị anaghị akpachara anya nata datà ụmụaka na-erubeghi afọ 18 na-ebughi ụzọ nata nne na nna ha ikike. Ọbụrụ na anyị achopụta na anyị natara ozi, tinyere Datà Keonwe, ndị erubeghi afọ 18 na-anataghị ikike n'aka nne na nna ha, anyị na-akachapụ ozi ahụ ozigbo.

Mgbanwega n'ọkwa nzuzo

Paxful nwere ikike igbanwe Ọkwa oge ọbụla ha chọrọ. Anyi ga-ezitere gị mgbanwega n'Ọkwa a site izitere gị Ọkwa nke gbanwere ebe a, na imeelu, maọbụ site n'ụzo ọkwa kacha mma na Webusaịt Paxful. Anyị tụrụ anya na ị ga na-eje na Webụsaịt iji hụ ma enwere mgbanwega.

Kpọtụrụ anyị

Ọbụrụ na inwere ajụjụ gbasara Ọkwa a, maọbụ ịjụase gbasara Datà Keonwe maọbụ nzuzo, biko kpọtụrụ anyị na: [email protected]

Mgbakwụnye EEA

Nchọpụta ndị a gbasatara, ma bụrụ maka naanị, ndị bi na mpaghara Ikọnọmi Europe (MIE)

Njikwa Datà

Ndị na-ejikwa Datà Keonwe gị bụ Paxful, Inc.

Ntọala iwu maka ịhazi Datà Keonwe

  • N'ogo anyị nwere iji Datà Keonwe rụọ ọrụ nkwekọrịta maọbu arịrịọ metụtara nkwekọrịta, Atịkụl 6(1)(b) nke Iwu Na-achịkwa Nchekwa Datà Ọha (''GDPR'') bụ iwu anyị dabeere n'inweta datà anyị.
  • N'ogo anyị ji eji Datà Keonwe arụ ọrụ n'rubeisi n'iwu ndị nọ n'okpuru EU maọbu iwu obodo so n'òtù a, Atịkụl 6(1)(c) nke GDPR bụ iwu anyi debeere na ịhazi datà.
  • N'ogo anyị ji eji Datà Keonwe iji chekwa ihe ndị dị ndị mmadụ mkpa, Atịkụl 6(1)(d) nke GDPR bụ iwu anyi debeere na ịhazi datà.
  • N'ogo anyị ji eji Datà Keonwe n'ịchụso azụmahịa ziri ezi dị mkpa, Atịkụl 6(1)(f) nke GDPR bụ iwu anyi debeere na ịhazi datà. Ndepụta azụmahịa anyi ziri ezi na ngalaba dị n'elu akpọrọ "Etu Anyị si Eji Datà Gị Eme Ihe".

Ikike nchekwa Datà ndị Europe

Iwu ndị Europe nyere gị ikike ụfọdụ na-ebe Datà Keonwe gị dị, gụnyere:

  • Ikike ịrịọ maka mmezi Datà Keonwe gị.
  • Ikike ịrịọ ka Paxful kachapụ ụfọdụ Datà Keonwe gbasara gị.
  • Ikike ibugharị datà, nke gụnyere ike ịrịọ ka anyị nyefee ụfọdụ Datà Keonwe i nyere anyị n'aka ndị ọzọ na-ejikwa datà.
  • Ikike ịhapụ nkwenye ọbụla i nyere Paxful iji nakọta, jiri, maọbụ kesaa n'oge ọbụla. Biko mara na ịhapụ nkwenye egbochighi iwu Paxful ịhazi Datà Keonwe gị tupu ịhapụ nkwenye a.
  • Ikike ịjụ na Paxful agaghị ahazi Datà Keonwe gị, n'ịgbadoụkwụ kpọmkwem n'ọnọdụ gị.
  • Ikike ịrịọ ka Paxful gbochie ịhazi Datà Keonwe gị, ọbụrụ na emejupụtara ọnọdụ iwu maka mmechi.
  • Ikike inye ndị nlekọta Europe mkpesa.

Biko mara na iwu dị adị nwere ike iwezuga ụfọdụ ikikega, nye Paxful ikike ka ha ghara anabatahgị arịrịọ gị maọbụ nye Paxful ikike ka ha gbatịa oge ha tupu ha anabata arịrịọ gị. Paxful nwere ike ịkpọ gị maka ikọwa onwe gị, dịka iwu nyere ohere, tupu emee ihe ịrịọrọ. Iji nweta ikike ndị a, biko kpọtụrụ anyị dịka edepụtara na ngalaba a dị n'elu akpọrọ "Kpọtụrụ Anyị".

Mbufega Mbaofesi

Anyị nwere inyefe Datà Keonwe gbasara ndị bi na EEA n'obodo ndị ọrụ Europe achọpụtabeghi iji nye ha ezi nchekwa, tinyere mba Amerịka. Maka nyefe ọbula dị etu ahụ, Paxful na-emejupụta nchekwa enwere iji hụ na Datà Keonwe gị nwetara nchekwa zuru òkè. Ọbụrụ na ịnọ na EEA, Paxful ga-enwe ike inyefe Datà Keonwe gị ma ọbụrụna: Enyela obodo ebe aga eziga Datà Keonwe gị ikike sitere n'alo ndị ọrụ nke ndị Europe; onye ga-anata Datà Keonwe nọ na Amerịka ma kwàdo usoro nchekwa nke nzuzo US-EU; Paxful etinyela nchekwa dị mma maka nnyefe, dịka ọmụmaatụ site n'ịbanye na nkwekọrịta ọkọlọtọ EU na onye nnata,maọbụ enwere ike ịhapụ izugbe iwu GDPR . Iji nweta otu usoro Paxful mezuru iji kwado nnyefe nke datà keonwe na-esoghi na EEA, kpọtụrụ anyị dịka e depụtara na ngalaba "Kpọtụrụ Anyị".

Mgbakụnye California

Ihe ndị a metụtara, maọbu maka naanị ndị bi na Steeti California.

Ikike Nzuzo California Gị

Ganye na anyị ekpughela ụfọdụ ozi ịmata gbasara gị nye ndị ọzọ na-eji ya maka ebumnuche azụmahịa ha, i nwere ikike ịrịo maka ozi ndị ọzọ gbasara ndị na-anata ozi maka gị. Iji gosi ikike a, biko kpọtụrụ anyị dịka akọwara na ngalaba dị n'elu akpọrọ "Kpọtụrụ Anyị".

Esola Nkwuputa

Ewubeghi Webụsaịt anyị iji zaghachi akara maọbụ arịrịọ "Esochina".

Eziokwu Kedu ihe Paxful ji ozi nkeonwe gị eme?
Gịnị kpatara?

Ulọ ọrụ na ahụ maka ego na-ahọrọ otu ha si ekekọrịta ozi nkeonwe gị. Iwu gọọmentị nyere ndị ahịa ikike igbochi ụfọdụ mana ọ bụghị ịkekọrịta ha niile. Iwu gọọmentị chọrọ ka anyị gwa gị otu anyị si anakọta, kesaa ma chebe ozi nkeonwe gị. Biko gụọ ọkwa a nke ọma ka ị ghọta ihe anyị na eme.

Gịnị?

Udị ozi nkeonwe anyị nakọtara ma kesaa dabere na ngwaahịa ma ọ bụ ọrụ ị nwere na anyị. Ozi a nwere ike ịgụnye:

  • Nọmba Nchekwa ma ọ bụ ụfọ akaụntụ
  • Akụkọ ọkwụkwụụgwọ ma ọ bụ akụkọ azụmahịa
  • Akụkọ akwụmụgwọ ma ọ bụ akara akwụmụgwọ

Mgbe ị bụ ghịzị onye ahịa anyị, anyị na aga n'ihu ịkekọrịta ozi gị dịka akọwara na ọkwa a.

Kedụ ka?

Ulọ ọrụ ego niile kwesịrị ịkekọrịta ozi nkeonwe nke ndị ahịa iji na azụ ahịa ha kwa ụbọchị. Na ngalaba dị n'okpuru, anyị depụtara ihe kpatara ụlọ ọrụ ego ji nwere ike iji kesaa ozi nkeonwe ndị ahịa ha; ihe mere Paxful ji horo ikekọrịta; na ma ị nwere ike ịkwụsị oke nkekọrịta a.


Ihe kpatara anyị nwere ike ịkekọrịta ozi nkeonwe gị.

Paxful a na e kekọrịta?

Nwere ike ịkwụsị ikekọrịta a?

Maka ebumnuche azụmaahịa anyị kwa ụbọchị - dị ka ịhazi azụmahịa gị, chekwaa akaụntụ gị, zaghachi iwu ụlọ ikpe na nchọpụta iwu, ma ọ bụ ịkọwa ụlọ ọrụ kredit.

Ee

Mba

Maka ebumnuche ahia anyị - iji nye ebumnobi orire na ọzụzụ ahịa gị ngwaahịa na ọrụ anyị

Ee

Mba

Maka ahịa na ụlọ ọrụ ego ndị ozo

Ee

Mba

Maka ebumnuche azụmaahịa ndị mmekọ anyị kwa ụbọchị - ozi gbasara azụmahịa na ahụmịhe gị

Ee

Mba

Maka ebumnuche azụmaahịa ndị mmekọ anyị kwa ụbọchị - ozi gbasara otuto gị

Mba

Anyị adịghị ekekọrịta

Maka ndị n’abughi ndị ahịa gị

Mba

Anyị adịghị ekekọrịta

Ajụjụ?

Gaa na www.paxful.com

Onye anyị bu

Onye na enye ama a?

Ihe nkwuputa nzuzo ahụ bụ Paxful nyere ma ọ metụtara na akaụntụ Paxful nkeonwe gị.

Ihe anyị na eme

Kedụ ka Paxful si echekwa ozi nkeonwe m?

Iji kpuchido ozi nkeonwe gị site na aka onye n'enweghi ikike, anyị na eji usoro nchekwa nke na agbaso iwu gọọmentị. Usoro ndị a gụnyere nchekwa kọmputa na faịlụ echekwara na ụlọ.

Kedụ ka Paxful si anakọta ozi nkeonwe m?

Anyị na anakọta ozi nkeonwe gị, dịka ọmụmaatụ, mgbe ị

  • Meghe akaụntụ ma ọ bụ nye ozi akaụntụ
  • nye anyị ozi kọntaktị ma ọ bụ mee mbufe
  • jiri akaụntụ Paxful gị ziga ma ọ bụ nata ego

Anyị na anakọtakwa ozi nkeonwe n'aka ndị ọzọ, dịka ụlọ ọrụ na akwụ ụgwọ, ndị mmekọ, na ụlọ ọrụ ndị ọzọ.

Kedu ihe kpatara na enweghị m ike ịkwụsị oke ịkekọrịta niile?

Iwu gọọmentị na enye gị ikike ịkwụsị oke naanị

  • ịkekọrịta maka ebumnuche azụmaahịa ndị mmekọ kwa ụbọchị - ozi gbasara otuto gị
  • ndị mmekọ site na iji ozi gị zigaara gị ahịa
  • ịkekọrịta maka ndị na abụghị ndị ahịa izigaara gị ahịa

Iwu Steeti na ụlọ ọrụ dị iche iche nwere ike inye gị ikike ọzọ iji belata nkekọrịta. Lee n'okpuru maka ndị ọzọ gbasara ikike gị n'okpuru iwu steeti.

Nkọwa

Mgbakwunye

Ndị ụlọ ọrụ nwere njikọ site na ịnwe ma ọ bụ njikwa nkịtị. Ha nwere ike ịbụ ụlọ ọrụ na anaghị ahụ maka ego na ụlọ ọrụ na abụ maka ego.

  • Ndị mmekọ anyị gụnyere ụlọ ọrụ n'okpuru njikwa nke Paxful Holdings, Inc.

Ndị na abụghị ndị mmekọ

Ndị ụlọ ọrụ n'enweghị njikọ site na ịnwe ma ọ bụ njikwa nkịtị. Ha nwere ike ịbụ ụlọ ọrụ na anaghị ahụ maka ego na ụlọ ọrụ na abụ maka ego.

  • Ndị na abụghị ndị mmekọ anyị na ha ekekọrịta ozi nkeonwe gụnyere ndị na enye ọrụ na arụ ọrụ ma ọ bụ na anọchite anyị.

Izukọ ahịa onu

Nkwekọrịta n'etiti ụlọ ọrụ ego na ndị anaghị akwado ọrụ na erere gị ngwaahịa ma ọ bụ ọrụ ego.

  • Ndị mmekọ izukọ ahịa ọnụ anyị gụnyere ụlọ ọrụ ego.

Ozi ndị ọzọ dị mkpa

Anyị nwere ike ịnyefe ozi nkeonwe na mba ndị ọzọ, dịka ọmụmaatụ, maka ọrụ ndị ahịa ma ọ bụ ịhazi azụmahịa.

California: Ọ bụrụ na akaụntụ Paxful gị nwere adreesị imeelu California, anyị agaghị ekekọrịta ozi nkeonwe anyị na anakọta gbasara gị belụsọ ma oke iwu enyere na California.

Vermont: Ọ bụrụ na akaụntụ Paxful gị nwere adreesị Vermont, anyị agaghị ekekọrịta ozi nkeonwe anyị na anakọta gbasara gị na ndị na abụghị ndị otu belụsọ na iwu kwere ma ọ bụ na ị nyere ikike