Biko chere ka anyị ga-enweta ebumnobi orire na ọzụzụ ahịa kacha mma maka gị.

Zụrụ na

Kwụọ ụgwọ na

Ọnụahịa otu Bitcoin

Ka e si azụta Bitcoin na Paxful

Zụta Bitcoin (BTC) na ọnụahịa kacha ala enwere ike n'agbanyeghị ebe ịnọ. Paxful na-arụ ọrụ na ụkpụrụ nke ego ndị ọgbọ-na-ọgbọ na-enyere gị aka ịzụta BTC na ihe dị ka 10 USD. Ị nwere ike ịzụta ozugbo n'aka ndị dị ka gị—na-enweghị ụlọ akụ ma ọ bụ ụlọ ọrụ.

Nke kacha mma? Enweghị ụgwọ ma ịzụta Bitcoin na Paxful. Nke ahụ pụtara na ị na-enwetakwu crypto na ego gị. N'ihi ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụzọ ịkwụ ụgwọ 400 dị na ikpo okwu, ị nwere ike ịtụgharị ego gị ka ọ bụrụ Bitcoin site n'obere akpa ego ma ọ bụ nnyefe ụlọ akụ. Ị nwekwara ike ịzụ ahịa ego crypto ndị ọzọ dị ka Ethereum maka Bitcoin, ma ọ bụ ọbụna ree kaadị onyinye iji nweta obere nke BTC na nyeghachi.

A na-echekwa Paxful site na nchekwa ọkwa di elu ma na-ahazi ya na United States dị ka Azụmahịa Ọrụ Ego. Ndị agha nyocha anyị na-enyocha ebe ahịa nke ọma na a na-achọpụtaeziokwu ndị ọrụ iji hụ na ebe azụmaahịa dị mma. Site na usoro nchekwa ndị a niile, ị nwere ike zuru ike ịmata na ozi gbasara gị na crypto gị di nchekwa na aka anyị.

Nke a bụ otu ị ga-esi malite ịzụrụ Bitcoin na Paxful:

  1. Debanye aha maka akaụntụ Paxful - Mepee ma chọpụta eziokwu akaụntụ gị iji nweta obere akpa Bitcoin efu gị nwere nchekwa 2FA. Ịtọlite ​​akaụntụ gị dị mfe ma enwere ike ime ya na nkeji ole na ole. Naanị ihe ị chọrọ bụ imelu adreesị, akara ekwentị, na ID ziri ezi iji malite.
  2. Chọta oree – Pia Zụta site na isi ndeputa wee họrọ Zụta Bitcoin. Tọọ ego ịchọrọ imefu, ego masịrị gị, yana usoro ịkwụ ụgwọ nke nhọrọ gi na wijetị sidebar iji chọta ndị oree mpaghara na nke mba ofesi dabara na ihe ị chọrọ.
    Anyị na-akwado nzacha maka Udi Onyeọrụ (Onyennọchiteanya, Asọshieti, etc.) iji gosi ndị na-ere ahịa akacha atụkwasị obi bụ ndị megoro ule mkpuchi nchekwa site na Paxful.
  3. Gụọ ihe ndị a chọrọ – Pia botin Zụta ilele usoro nke onye na-ere ahịa. Dabere na usoro ịkwụ ụgwọ, ndị na-ere ahịa nwekwara ike ịrịọ gị ka ịnye nseta ihuenyo ego sitere na obere akpa ịntanetị gị, foto mpempe akwụkwọ nkwụnye ego ụlọakụ, ma ọ bụ akwụkwọ ọkwụkwụụgwọ kaadị onyinye ị zụrụ. Ụfọdụ ndị na-ere ahịa nwekwara ike ịrịọ gị ka iziga foto onwe ebe iji ID ziri ezi maka ebumnuche nchekwa agbakwunyere.
  4. Malite azụmahịa – Ọ bụrụ na ị nwere ike ịgbaso usoro nke onye na-ere ahịa, debe ego ole nke Bitcoin ịchọrọ ịzụta na wijetị wee pịa Zụta ugbua iji bido azụmahịa. Nke a ga-emepe mkparịta ụka ndụ gi na onye na-ere ahịa ebe ị ga-enweta ntụziaka ndị ọzọ gbasara otu esi emecha ahia ahụ. Mkparịta ụka ahụ ndụ na-edekọ ozi niile, ọ ga-echebekwa gị ma ọ bụrụ na ị ga-enwe nsogbu ọ bụla, yabụ biko Akparịtala ụka na mpụga Paxful.
  5. Zipụ ụgwọ ma nata BTC gị – Ozugbo emechara ihe niile achọrọ na onye na-ere ahịa na-enye akara ngosi iga n'ihu, nyefee ugwo wee pịa Akwụọla ụgwọ ozugbo. N'oge a, a na-akpọchi BTC nke onye na-ere ahịa na ego edebere ruo na azụchaa ahịa iji gbochie onye gị na ya na-azụ ahịa ịnakwere ịkwụ ụgwọ gị ma ghara ịhapụ crypto. Ozugbo onye na-ere ahịa kwenyere ịkwụ ụgwọ gị, a ga-ahapụ Bitcoin na ego edebere ruo na azụchaa ahịa ma bufee ya na obere akpa Paxful gị.

Ihe niile fọdụrụ bụ inye onye na-ere ahịa nyocha nke ahụmahụ gị na ọ bụ ya! Maka ozi ndị ọzọ, ị nwekwara ike ilele usoro nlegharị anya vidiyo anyị zuru ezu maka otu esi azụta Bitcoin na Paxful.

Ọ bụrụ na ị nwere ajụjụ ọ bụla, biko pịa akara nkata dị n'akụkụ aka nri ala nke ibe ahụ ka ị kpọtụrụ ndị otu nkwado anyị. Anyị nọ ebe a maka gị 24/7—ọbụna na ubochi ezumike!

Ịzụta Bitcoin na Paxful dị mma ma dị mfe, mana ewerela okwu anyị maka ya—<gụọ nyocha sitere na ọtụtụ ndị ọrụ Paxful gburugburu ụwa.